How I pray in Igbo

 

Ọ bụ n’aha Jesus

Ezi onye nwe anyị na Chineke

Ana m ekele Gị maka ndụ I nyere m

Ndụ ezinaụlọ m

Ndụ ndị enyi m

Ana m asị ka ekele niile dịrị aha nsọ Gị

Ana m ekele Gị maka di m

Maka ụmụaka m

Maka ọrụ m

Maka ụlọ anyị bi n’ime ya

Maka nri

M na-asị ka otito na ekele niile bụrụ nke Gị n’aha Jesus

Nna biko

M na-arịọ, gbaghara m mmehie m niile

Biko gbaghara anyị mmehie anyị n’ezinaụlọ m

Ụzọ ọbụla anyị si mejọọ, Nna biko gbaghara

 

Biko dube anyị ụbọchị niile nke ndụ anyị

Dube anyị n’okwu Gị

Dube anyị n’ụzọ Gị

Nna, m na-arịo biko

Ka Ị nonyere onye na-agụ ekpere a

Ndị niile na-abịa na ‘website’ a

Mee ka ha na-eso ụzọ Gị

Mee ka ha mara na Ị hụrụ ha n’anya

Nna m na-asị ka ịja mma niile

Ekele niile

Otito niile

Nsọpụrụ niile

Dịrị aha nsọ Gị

N’aha Jesus

Amen (Isee – in Igbo)

 

In Jesus name

Our Lord and our God

I thank you for the life you gave me

The life of my family

The life of my friends

May all thanksgiving be to Your holy name

I thank You for my husband

For my children

For my work

For the house we live in

For food

May all praise and thanksgiving be Yours in Jesus name, Amen

Please Father

Forgive me all my sins

Forgive us our sins as a family

In any way we have sinned,

Father please forgive

Please lead and guide us everyday of our lives

Lead us in your Word

Lead us in Your way

Father, please I ask

That you be with the person reading this prayer

All the people that visit this website

Please lead them in Your path

May they know that You love them

May all praise

All thanksgiving

All glory

All honour

Be unto Your holy name

In Jesus name

Amen